Job 21

Okwu Job

1Mgbe ahụ, Job zara sị:

2“Gee ntị nke ọma nʼokwu m;
ka nke a bụrụ nkasiobi ị ga-enye m.
3Nwee ndidi ka m kwuchaa okwu m,
mgbe m kwuchara, gaa nʼihu ịkwa m emo.

4“Ọ bụ mmadụ ka m na-ekpesara?
Gịnị ka m ga-eji ghara ịbụ onye na-enweghị ndidi?
5Lee m anya ka ahụ maa gị jijiji;
were aka gị kpuchie ọnụ gị.
6Mgbe m chere echiche maka nke a, egwu tụrụ m
meekwa ka ahụ m maa jijiji.
7Gịnị mere ndị ajọ omume ji enwe ndụ ogologo,
ghọọ okenye, baakwa ụba nʼịdị ike?
8Ha na-ahụ ụmụ ka ha na-akwụsike ike gburugburu ha,
ụmụ ha ka ha ji anya ha ahụ.
9Ha na-ebi ndụ udo nʼezinaụlọ ha na-atụghị egwu na ihe ọjọọ ọbụla ga-adakwasị ha;
mkpara Chineke adịghịkwa adakwasị ha.
10Oke ehi ha na-agba nne ehi ha na-esepụghị aka;
nne ehi ha na-amụ ụmụ, ha adịghị ekwo ime.
11Ha na-ezipụ ụmụ ha dịka igwe atụrụ;
ụmụntakịrị ha na-etegharị egwu.
12Ha na-abụ abụ nʼụda egwu otiti na ụbọ akwara;
ha na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼụda nke ọja.
13Ha na-anọ ụbọchị ndụ ha niile nʼọganihu,
ha na-arịdakwa nʼili ha nʼudo.
14Ma ndị a na-asị Chineke, ‘Hapụ anyị aka,
ọ dịghị anyị mkpa ịmata ụzọ gị.
15Onye ka Onye pụrụ ime ihe niile bụ, anyị ga-eji jeere ya ozi?
Uru gịnị ka ịrịọ ya arịrịọ ga-abara anyị?’
16Ma ọganihu ha adịghị nʼaka ha
ya mere ana m ewezuga onwe m site na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu.

17“Ma ugboro ole ka a na-emenyụ ọkụ oriọna nke ndị na-emebi iwu?
Ugboro ole ka nhụju anya na-adakwasị ha,
bụ nke Chineke kenyere ha nʼiwe ya?
18Ugboro ole ka ha dịka ahịhịa kpọrọ nkụ nʼihu ikuku,
maọbụ dịka igbugbo ọka nke ikuku siri ike na-efesasị?
19A na-asị, ‘Chineke na-akpakọtara ụmụ ha ntaramahụhụ nke njehie ha.’
Ka a kwụghachi ha ya, ka ha nwee ike mata ya.
20Ka anya ha hụ mbibi nke onwe ya,
ka ha ṅụọ ọnụma nke Onye pụrụ ime ihe niile dịka mmiri.
21Gịnị gbasara ha banyere ezinaụlọ ha hapụrụ
mgbe ọnwa ndị e kenyere ya bịara na ngwụcha?

22“Ọ dị onye pụrụ izi Chineke ihe ọmụma,
ebe ọ bụ ya na-ekpe ndị kachasị elu ikpe?
23Otu onye na-anwụ mgbe o jupụtara nʼike na ume,
mgbe ọ nọ na nchekwa na udo,
24mgbe ahụ ya bụ nke eji ezi nri zụọ nke ọma,
ọkpụkpụ ya jupụtakwara nʼụmị.
25Onye ọzọ na-anwụ nʼihe ilu nke mkpụrụobi,
nʼihi na o nweghị mgbe o riri ezi ihe ọbụla.
26Nke ọbụla nʼime ha dina nʼakụkụ ibe ya nʼime aja,
ikpuru kpuchikwara ha abụọ.

27“Amaara m nke ọma ihe bụ echiche unu
na nzube unu ji emegide m.
28Unu ga-ajụ m ajụjụ sị, ‘Ugbu a, ole ụlọ oke mmadụ ahụ.
Ụlọ ikwu ndị ahụ ebe ndị na-emebi iwu biiri?’
29Ọ bụ na unu ajụbeghị ndị njem ajụjụ?
Ọ bụ na unu ejighị ihe ha kọrọ mere ihe,
30na a na-echebe ndị ọjọọ pụọ nʼụbọchị nhụju anya,
na a na-anapụta ha site nʼụbọchị oke iwe?
31Onye na-atụ ha mmehie ha nʼihu?
Onye kwa na-akwụghachi ha ụgwọ ihe ha mere?
32A na-eburu ha gaa nʼili,
a na-echekwa ili ha nche.
33Aja dị na ndagwurugwu na-atọ ha ụtọ;
Mmadụ niile na-eso ha nʼazụ,
na ọtụtụ a na-apụghị ịgụta ọnụ na-ebu ha ụzọ nʼaga.

34“Ya mere, olee otu unu ga-esi were okwu na-enweghị isi kasịe m obi?
Ọ dịghị ihe fọdụrụ nʼọsịịsa unu ma ọ bụghị naanị okwu ụgha.”
Copyright information for IboBIU